Ọpụpụ 21

mgbe ahụ, onyenwe ya ga-eduru ya bịakwute Chineke. Mgbe ọ kpọbatasịrị ya nʼọnụ ụzọ, onyenwe ya ga-eji agịga dupuo ntị ya. Malite nʼoge ahụ, ọ ga-abụkwa ohu ya ruo ọgwụgwụ ndụ ya.

Exodus 21:6 (UKJV) Then his master shall bring him unto the judges; he shall also bring him to the door, or unto the door post; and his master shall bore his ear through with an aul; and he shall serve him for ever.

4Ọ bụrụ na nna ya ukwu kpọnyere ya nwunye onye mụtaara ya ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, nwanyị ahụ na ụmụ ya ga-abụ nke nna ya ukwu, naanị nwoke ahụ ga-enwere onwe ya.

5“Ma ọ bụrụ na ohu ahụ asị, nʼezie, ‘Ahụrụ m onyenwe m na nwunye m na ụmụ m nʼanya, achọghị m inwere onwe,’

6mgbe ahụ, onyenwe ya ga-eduru ya bịakwute Chineke. Mgbe ọ kpọbatasịrị ya nʼọnụ ụzọ, onyenwe ya ga-eji agịga dupuo ntị ya. Malite nʼoge ahụ, ọ ga-abụkwa ohu ya ruo ọgwụgwụ ndụ ya.

7“A sị na nwoke eree nwa ya nwanyị dịka ohu, agaghị ala otu ndị ohu nwoke si ala.

8Ọ bụrụ na ihe nwanyị ahụ amasịkwaghị onyenwe ya, onye họọrọ ya nye onwe ya, onyenwe ya ga-ekwere ka a gbapụta ya. Ma ọ gaghị eresi ya ndị ọbịa. Nʼihi na onyenwe ya emeela nwanyị ahụ ihe ọjọọ mgbe ọ jụrụ na ọ gaghị alụkwa ya ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.