1“Ọ bụrụ na mmadụ ezuru ehi maọbụ atụrụ gbuo ya, maọbụ ree ya, ọ ga-akwụghachi ehi ise nʼọnọdụ ehi ahụ. Nʼọnọdụ otu atụrụ o zuuru, ọ ga-akwụghachi atụrụ anọ.
2“Ọ bụrụ na e jide onye ohi mgbe ọ na-egbuka ụlọ onye ọzọ, ọ bụrụkwa na e tigbuo ya, mee ka ọ nwụọ, iwu ejideghị onye ahụ gburu ya.
3Kama ọ bụrụ na e tigburu onye ahụ mgbe chi bọcharala, ọmụma ikpe ga-adịrị onye ahụ tigburu ya. “Ọ bụrụ na e jide onye ohi, a ga-eme ka ọ kwụghachi ihe o zuru nʼohi. Ọ bụrụ na o nweghị ike kwụghachi, a ga-ere ya dịka ohu, jiri ego e retara kwụọ ụgwọ o ji.
4Ọ bụrụ na a chọta ihe o zuru nʼaka ya, maọbụ ehi, maọbụ ịnyịnya ibu, maọbụ atụrụ, ọ ga-akwụghachi ọnụahịa ya okpukpu abụọ.