26Ọ bụrụ na ị nara ya uwe ya nʼihi ego ahụ ị gbazinyere ya, ekwela ka uwe ahụ nọgide nʼaka gị ruo mgbe anwụ dara.
27Nʼihi na uwe ahụ nwere ike bụrụ naanị ihe o nwere, maọbụ uwe ọ ga-eji rahụ ụra. Ọ bụrụ na i zighachighị ya, o tikuo m site nʼịkwa akwa, aga m anụrụ mkpu akwa ya, nʼihi na abụ m onye obi ebere.
28“Ekwulula aha Chineke, abụkwala onye na-achị ndị gị ọnụ.
29“Atụfukwala oge ọbụla nʼịkwụghachi onyinye unu kwesiri inye. Maọbụ nke mkpụrụ ala ubi gị, na nke mmanya vaịnị gị, na ụgwọ i kwesiri ịkwụ. “Ị ghaghị inye m nwa gị nwoke e buru ụzọ mụọ.
30Otu a ka ị ga-emekwa banyere mkpụrụ mbụ nke ehi gị na atụrụ gị. Ị ga-ewebata ya nye m nʼụbọchị nke asatọ site nʼoge a mụrụ ha, mgbe ị hapụsịrị ha nne ha ụbọchị asaa.