1“Ị gaghị agbasa akụkọ ụgha ọbụla. Esokwala mmadụ ọjọọ nwekọọ ihe ọbụla site nʼịgba ama ị maara na ọ bụghị eziokwu.
2“Ị gaghị eso igwe mmadụ mee ihe ọjọọ. Mgbe ị na-agba akaebe nʼụlọikpe, ị gaghị esonye igwe mmadụ ndị na-atụgharị ikpe ziri ezi.
3Nʼebe nwa ogbenye nọ, ị gaghị ekpelara ya nʼoge ikpe nʼihi na ọ bụ nwa ogbenye.