Ọpụpụ 24

Ọ gwara Mosis sị, “Rigokwute Onyenwe anyị, gị na Erọn, na Nadab, na Abihu, na mmadụ iri asaa site na ndị okenye Izrel. Ma unu ga-efe ofufe site nʼebe dị anya.

Exodus 24:1 (UKJV) And he said unto Moses, Come up unto the LORD, you, and Aaron, Nadab, and Abihu, and seventy of the elders of Israel; and worship all of you far off.

1Ọ gwara Mosis sị, “Rigokwute Onyenwe anyị, gị na Erọn, na Nadab, na Abihu, na mmadụ iri asaa site na ndị okenye Izrel. Ma unu ga-efe ofufe site nʼebe dị anya.

2Emesịa, ọ bụ naanị Mosis ga-abịarute Onyenwe anyị nso. Ndị nke ọzọ agaghị abịaru nso. Ndị mmadụ ndị ọzọ agaghịkwa eso ya rigota.”

3Mgbe ahụ, Mosis bịara gwa ndị Izrel okwu niile na iwu niile Onyenwe anyị nyere. Ha niile zaghachiri ya nʼotu olu sị, “Anyị ga-emezu ihe niile Onyenwe anyị kwuru.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.