Ọpụpụ 24

Emesịa, ọ bụ naanị Mosis ga-abịarute Onyenwe anyị nso. Ndị nke ọzọ agaghị abịaru nso. Ndị mmadụ ndị ọzọ agaghịkwa eso ya rigota.”

Exodus 24:2 (UKJV) And Moses alone shall come near the LORD: but they shall not come nigh; neither shall the people go up with him.

1Ọ gwara Mosis sị, “Rigokwute Onyenwe anyị, gị na Erọn, na Nadab, na Abihu, na mmadụ iri asaa site na ndị okenye Izrel. Ma unu ga-efe ofufe site nʼebe dị anya.

2Emesịa, ọ bụ naanị Mosis ga-abịarute Onyenwe anyị nso. Ndị nke ọzọ agaghị abịaru nso. Ndị mmadụ ndị ọzọ agaghịkwa eso ya rigota.”

3Mgbe ahụ, Mosis bịara gwa ndị Izrel okwu niile na iwu niile Onyenwe anyị nyere. Ha niile zaghachiri ya nʼotu olu sị, “Anyị ga-emezu ihe niile Onyenwe anyị kwuru.”

4Mosis deturu ihe niile Onyenwe anyị kwuru. Nʼisi ụtụtụ echi ya, o biliri wuo ebe ịchụ aja na ndịda ugwu ahụ. O gwunyere ogidi nkume iri na abụọ nke nọchiri anya ebo iri na abụọ ụmụ Izrel.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.