10Ha hụrụ Chineke nke Izrel. Nʼokpuru ụkwụ ya abụọ, e were ihe dịka ebe nzọkwasị ụkwụ nke e ji nkume safaia mee. Nkume ndị a na-enwukwa ezi onwunwu dịka mbara eluigwe.
11Ọ bụ ezie na ndị okenye Izrel hụrụ Chineke anya ma ọ laghị ha nʼiyi. Kama o mere ka ha nọọ nʼihu ya rie, ṅụọ.
12Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Rigota, bịakwute m nʼelu ugwu, nọdụkwa ebe ahụ, maka na aga m enye gị mbadamba nkume nke iwu na ụkpụrụ dị na ya, nke m ji aka m dee maka i ji kuziere ha.”
13Mosis biliri, ya na Joshua onye na-agara ya ozi. Mosis nʼonwe ya rigokwara nʼelu ugwu Chineke.
14Ọ gwara ndị okenye Izrel okwu sị, “Cherenụ anyị nʼebe a tutu ruo mgbe anyị ga-alaghachikwute unu. Unu na Erọn na Hua nọ, onye ọbụla nwere nsogbu jekwuru ha.”