8Mgbe ahụ, Mosis weere ọbara ahụ dị nʼime efere, fesaa ya nʼahụ ndị ahụ niile, sị, “Nke a bụ ọbara ọgbụgba ndụ ahụ nke dị nʼetiti unu na Onyenwe anyị, dịka okwu niile ndị a si dị.”
9Mosis rigoro nʼelu ugwu, ya na Erọn, na Nadab na Abihu, na mmadụ iri asaa site na ndị okenye Izrel.
10Ha hụrụ Chineke nke Izrel. Nʼokpuru ụkwụ ya abụọ, e were ihe dịka ebe nzọkwasị ụkwụ nke e ji nkume safaia mee. Nkume ndị a na-enwukwa ezi onwunwu dịka mbara eluigwe.
11Ọ bụ ezie na ndị okenye Izrel hụrụ Chineke anya ma ọ laghị ha nʼiyi. Kama o mere ka ha nọọ nʼihu ya rie, ṅụọ.
12Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Rigota, bịakwute m nʼelu ugwu, nọdụkwa ebe ahụ, maka na aga m enye gị mbadamba nkume nke iwu na ụkpụrụ dị na ya, nke m ji aka m dee maka i ji kuziere ha.”