7Emesịa, Mosis guzoro nʼebe ahụ gụpụta na ntị mmadụ niile, ihe dị nʼAkwụkwọ Ọgbụgba ndụ ahụ. Mgbe ụmụ Izrel nụrụ ya, ha weere otu olu kwuo sị, “Anyị anụla, anyị ga-eme ihe niile Onyenwe anyị kwuru. Anyị ga-erube isi.”
8Mgbe ahụ, Mosis weere ọbara ahụ dị nʼime efere, fesaa ya nʼahụ ndị ahụ niile, sị, “Nke a bụ ọbara ọgbụgba ndụ ahụ nke dị nʼetiti unu na Onyenwe anyị, dịka okwu niile ndị a si dị.”
9Mosis rigoro nʼelu ugwu, ya na Erọn, na Nadab na Abihu, na mmadụ iri asaa site na ndị okenye Izrel.
10Ha hụrụ Chineke nke Izrel. Nʼokpuru ụkwụ ya abụọ, e were ihe dịka ebe nzọkwasị ụkwụ nke e ji nkume safaia mee. Nkume ndị a na-enwukwa ezi onwunwu dịka mbara eluigwe.
11Ọ bụ ezie na ndị okenye Izrel hụrụ Chineke anya ma ọ laghị ha nʼiyi. Kama o mere ka ha nọọ nʼihu ya rie, ṅụọ.