16ebube Onyenwe anyị kpuchikwara elu ugwu ahụ. Ọ bụ ụbọchị isii ka igwe ojii kpuchiri ugwu ahụ. Nʼụbọchị nke asaa, Onyenwe anyị sitere nʼetiti igwe ojii ahụ kpọọ Mosis oku.
17Ma nʼebe ndị Izrel nọ, ebube Onyenwe anyị na-enwu dịka ọkụ na-achọ irechapụ ugwu ahụ.
18Mosis banyere nʼime igwe ojii ahụ mgbe ọ na-arịgo ugwu ahụ. Ọ nọgidere nʼelu ugwu ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị.