Ọpụpụ 25

Rụọ otu cherub nʼotu nsọtụ, otu cherub na nsọtụ nke ọzọ; mee ka cherubim ndị a na okwuchi igbe ahụ bụrụ otu na nsọtụ abụọ ahụ.

Exodus 25:19 (UKJV) And make one cherub on the one end, and the other cherub on the other end: even of the mercy seat shall all of you make the cherubims on the two ends thereof.

17“Ị ga-ejikwa ọlaedo a nụchara anụcha mee ihe mkpuchi igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Ogologo ya ga-adị nzọ ụkwụ anọ. Obosara ya ga-abụ nzọ ụkwụ abụọ na ọkara.

18Ị ga-eji ọlaedo a nụchara anụcha, nke e tipịara etipịa kpụọ cherubim abụọ na nsọtụ abụọ nke ebe mkpuchi ahụ.

19Rụọ otu cherub nʼotu nsọtụ, otu cherub na nsọtụ nke ọzọ; mee ka cherubim ndị a na okwuchi igbe ahụ bụrụ otu na nsọtụ abụọ ahụ.

20Cherubim ndị a ga-agbasa nku ha laa elu, were ha na-ekpuchi okwuchi ahụ. Cherubim ndị ahụ ga-eche onwe ha ihu, na-ele anya nʼebe okwuchi ahụ dị.

21Tụkwasị ihe mkpuchi ahụ nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Tinyekwa Ihe Ama ahụ m nyere gị nʼime igbe ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.