15Nʼihi nke a, mkpara ọlaedo ndị ahụ ga-adịgide nʼime mgbaaka ọlaedo igbe a oge niile.
16Ya mere, mgbe a rụsịrị igbe ọgbụgba ndụ ahụ, tinye Ihe Ama ahụ m nyere gị nʼime ya.
17“Ị ga-ejikwa ọlaedo a nụchara anụcha mee ihe mkpuchi igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Ogologo ya ga-adị nzọ ụkwụ anọ. Obosara ya ga-abụ nzọ ụkwụ abụọ na ọkara.
18Ị ga-eji ọlaedo a nụchara anụcha, nke e tipịara etipịa kpụọ cherubim abụọ na nsọtụ abụọ nke ebe mkpuchi ahụ.
19Rụọ otu cherub nʼotu nsọtụ, otu cherub na nsọtụ nke ọzọ; mee ka cherubim ndị a na okwuchi igbe ahụ bụrụ otu na nsọtụ abụọ ahụ.