14Ị ga-etinye mkpara ndị ahụ nʼime mgbaaka ahụ dị nʼakụkụ igbe ahụ, ka ọ bụrụ ihe iji na-ebu ya.
15Nʼihi nke a, mkpara ọlaedo ndị ahụ ga-adịgide nʼime mgbaaka ọlaedo igbe a oge niile.
16Ya mere, mgbe a rụsịrị igbe ọgbụgba ndụ ahụ, tinye Ihe Ama ahụ m nyere gị nʼime ya.
17“Ị ga-ejikwa ọlaedo a nụchara anụcha mee ihe mkpuchi igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Ogologo ya ga-adị nzọ ụkwụ anọ. Obosara ya ga-abụ nzọ ụkwụ abụọ na ọkara.
18Ị ga-eji ọlaedo a nụchara anụcha, nke e tipịara etipịa kpụọ cherubim abụọ na nsọtụ abụọ nke ebe mkpuchi ahụ.