Ọpụpụ 25

“Jiri osisi akashia mee tebul nke ogologo ya ga-adị iri sentimita itoolu. Obosara ya ga-abụ iri sentimita anọ na ise. Ịla elu ya ga-abụ iri sentimita isii na asaa.

Exodus 25:23 (UKJV) You shall also make a table of shittim wood: two cubits shall be the length thereof, and a cubit the breadth thereof, and a cubit and a half the height thereof.

21Tụkwasị ihe mkpuchi ahụ nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Tinyekwa Ihe Ama ahụ m nyere gị nʼime igbe ahụ.

22Nʼebe ahụ, nʼetiti cherubim abụọ ndị ahụ dị nʼelu ihe mkpuchi igbe ọgbụgba ndụ, ka m ga-ezute gị, nye gị iwu niile ị ga-enye ndị Izrel.

23“Jiri osisi akashia mee tebul nke ogologo ya ga-adị iri sentimita itoolu. Obosara ya ga-abụ iri sentimita anọ na ise. Ịla elu ya ga-abụ iri sentimita isii na asaa.

24Ị ga-eji ọlaedo a nụchara anụcha machie ya nke ọma, jirikwa ọlaedo kpụọ ọnụ ọnụ ya gburugburu.

25Ị ga-etinye ihe njikọta a kpụrụ akpụ gburugburu ọnụ ọnụ ya, nke ga-aha ka otu ọbụ aka dimkpa. A ga-eji mpempe ọlaedo techie ihe njikọta ahụ gburugburu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.