Ọpụpụ 25

Kpụọ mgbaaka ọlaedo anọ maka tebul ahụ, kwụnye ha nʼakụkụ anọ ahụ nke ụkwụ anọ ya.

Exodus 25:26 (UKJV) And you shall make for it four rings of gold, and put the rings in the four corners that are on the four feet thereof.

24Ị ga-eji ọlaedo a nụchara anụcha machie ya nke ọma, jirikwa ọlaedo kpụọ ọnụ ọnụ ya gburugburu.

25Ị ga-etinye ihe njikọta a kpụrụ akpụ gburugburu ọnụ ọnụ ya, nke ga-aha ka otu ọbụ aka dimkpa. A ga-eji mpempe ọlaedo techie ihe njikọta ahụ gburugburu.

26Kpụọ mgbaaka ọlaedo anọ maka tebul ahụ, kwụnye ha nʼakụkụ anọ ahụ nke ụkwụ anọ ya.

27Mgbaaka ndị ahụ ga-adị nso nso, ihe njikọ ahụ ka ha jide mkpara ndị ahụ, i ji ebu tebul ahụ.

28Jiri osisi akashia mee mkpara a ga-eji na-ebu tebul ahụ. Jiri ọlaedo techie ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.