25Ị ga-etinye ihe njikọta a kpụrụ akpụ gburugburu ọnụ ọnụ ya, nke ga-aha ka otu ọbụ aka dimkpa. A ga-eji mpempe ọlaedo techie ihe njikọta ahụ gburugburu.
26Kpụọ mgbaaka ọlaedo anọ maka tebul ahụ, kwụnye ha nʼakụkụ anọ ahụ nke ụkwụ anọ ya.
27Mgbaaka ndị ahụ ga-adị nso nso, ihe njikọ ahụ ka ha jide mkpara ndị ahụ, i ji ebu tebul ahụ.
28Jiri osisi akashia mee mkpara a ga-eji na-ebu tebul ahụ. Jiri ọlaedo techie ha.
29Ọzọkwa, jiri ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ efere dị iche iche, na iko dị iche iche, na ọkwa dị iche iche, nke e ji awụpụ onyinye.