2“Gwa ụmụ Izrel ka ha wetara m onyinye. Ị ga-anabatara m onyinye ahụ site nʼaka nwoke ọbụla onye o metụrụ nʼobi inye onyinye a.
3“Ndị a bụ Onyinye ị ga-anata nʼaka ha: “ọlaọcha, ọlaedo na bronz.
4Ogho na-acha anụnụ anụnụ, nke odo odo, nke uhie uhie, nke ezi akwa ọcha, na nke ajị ewu;
5akpụkpọ anụ ebule e sijiri uhie uhie, akpụkpọ ehi mmiri, na osisi akashia;
6mmanụ oliv nke a ga-etinye nʼiheọkụ, ụda isi ụtọ a na-etinye na mmanụ nsọ, na ụda na-eme ka aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ;