4Ogho na-acha anụnụ anụnụ, nke odo odo, nke uhie uhie, nke ezi akwa ọcha, na nke ajị ewu;
5akpụkpọ anụ ebule e sijiri uhie uhie, akpụkpọ ehi mmiri, na osisi akashia;
6mmanụ oliv nke a ga-etinye nʼiheọkụ, ụda isi ụtọ a na-etinye na mmanụ nsọ, na ụda na-eme ka aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ;
7nkume ọma ọniks, na nkume ndị ọzọ a na-ahịọnye nʼefọọd, na nke a na-ahịọnyekwa nʼihe mgbochi obi.
8“Mee ka ha wuoro m ebe nsọ. Mụ onwe m ga-ebikwa nʼetiti ha.