6mmanụ oliv nke a ga-etinye nʼiheọkụ, ụda isi ụtọ a na-etinye na mmanụ nsọ, na ụda na-eme ka aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ;
7nkume ọma ọniks, na nkume ndị ọzọ a na-ahịọnye nʼefọọd, na nke a na-ahịọnyekwa nʼihe mgbochi obi.
8“Mee ka ha wuoro m ebe nsọ. Mụ onwe m ga-ebikwa nʼetiti ha.
9Wuo ụlọ nzute a na ihe ịchọ ya mma niile, ka ọ bụrụ otu ihe dịka oyiyi m ga-egosi gị.
10“Ha ga-eji osisi akashia wuo igbe ọgbụgba ndụ nke ịdị ogologo ya ga-abụ otu mita na sentimita iri. Obosara ya bụ sentimita iri isii na asatọ. Ịla elu ya ga-abụkwa sentimita iri isii na asatọ.