15“Ị ga-emere ụlọ nzute ahụ mbudo ibo osisi akashia, guzo ọtọ.
16Mbudo ibo ọbụla ga-adị mita anọ na ọkara nʼogologo, dịrịkwa iri sentimita asaa nʼobosara.
17Mbudo ibo ndị a ga-enwe ihe nhịọnye abụọ nke ga-abanye nʼime ibe ya ijikọ ha nʼotu. Ị ga-arụ mbudo ibo ụlọ nzute ahụ niile otu a.
18Ị ga-arụ mbudo ibo iri abụọ maka akụkụ ndịda nke ụlọ nzute ahụ.
19Meekwa iri ụkwụ ọlaọcha anọ nʼokpuru ha. Otu mbudo ibo ga-enwe ụkwụ abụọ, otu ụkwụ nʼokpuru otu ihe nhịọnye, otu ụkwụ nʼokpuru ihe nhịọnye nke ọzọ.