17Mbudo ibo ndị a ga-enwe ihe nhịọnye abụọ nke ga-abanye nʼime ibe ya ijikọ ha nʼotu. Ị ga-arụ mbudo ibo ụlọ nzute ahụ niile otu a.
18Ị ga-arụ mbudo ibo iri abụọ maka akụkụ ndịda nke ụlọ nzute ahụ.
19Meekwa iri ụkwụ ọlaọcha anọ nʼokpuru ha. Otu mbudo ibo ga-enwe ụkwụ abụọ, otu ụkwụ nʼokpuru otu ihe nhịọnye, otu ụkwụ nʼokpuru ihe nhịọnye nke ọzọ.
20Nʼakụkụ nke ọzọ, bụ akụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ, ị ga-arụkwa iri mbudo ibo abụọ.
21Rụkwaa iri ụkwụ ọlaọcha anọ, ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla.