1“Rụọ ụlọ nzute nke ga-enwe akwa mgbochi iri, nke e ji ezi ogho na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie kpaa akwa ndị a. Onye ọrụ aka na-eme ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ha.
2Akwa mgbochi ndị a ga-aha nʼotu. O nweghị nke ga-aka ibe ya. Ogologo akwa mgbochi ọbụla ga-abụ mita iri na abụọ na ọkara. Obosara ya bụ otu mita na sentimita asatọ.
3Dụkọtaa akwa mgbochi ise nʼotu, dụkọtaakwa ise nke ọzọ nʼotu.
4Jiri akwa na-acha anụnụ anụnụ dụnye anya nko nʼelu ọnụ akwa mgbochi nke otu ụzọ, otu a ka ị ga-emekwa na nsọtụ ọnụ akwa mgbochi nke ọzọ.