2Akwa mgbochi ndị a ga-aha nʼotu. O nweghị nke ga-aka ibe ya. Ogologo akwa mgbochi ọbụla ga-abụ mita iri na abụọ na ọkara. Obosara ya bụ otu mita na sentimita asatọ.
3Dụkọtaa akwa mgbochi ise nʼotu, dụkọtaakwa ise nke ọzọ nʼotu.
4Jiri akwa na-acha anụnụ anụnụ dụnye anya nko nʼelu ọnụ akwa mgbochi nke otu ụzọ, otu a ka ị ga-emekwa na nsọtụ ọnụ akwa mgbochi nke ọzọ.
5Dụnye iri anya nko ise nʼotu akwa mgbochi, dụnyekwa iri anya nko ise nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ. Mee ka anya nko ndị a chee ibe ha ihu.
6Ị ga-emekwa iri nko ọlaedo ise, nke ị ga-eji jikọta akwa mgbochi abụọ ahụ nʼotu, si otu a mee ka ụlọ nzute ahụ bụrụ otu.