Ọpụpụ 26

“Guzobe ụlọ nzute a nʼusoro dịka ụdịdị ihe ahụ m ziri gị nʼelu ugwu si dị.

Exodus 26:30 (UKJV) And you shall rear up the tabernacle according to the fashion thereof which was showed you in the mount.

28Osisi ntụbichi nke dị nʼetiti ga-esite nʼotu isi ruo nʼisi nke ọzọ nke mbudo ibo ahụ.

29Jiri ọlaedo machie mbudo ibo ndị ahụ niile, kpụọ mgbaaka ọlaedo ka ọ bụrụ ọnọdụ ịchịkọta osisi ntụbichi ndị a. Jirikwa ọlaedo machie osisi ntụbichi ndị a.

30“Guzobe ụlọ nzute a nʼusoro dịka ụdịdị ihe ahụ m ziri gị nʼelu ugwu si dị.

31“Meekwa akwa mgbochi nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, onye ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya.

32Were anya nko ọlaedo kwụba ya nʼelu ogidi osisi akashia anọ nke e ji ọlaedo machie, mee ka o guzoro nʼelu ụkwụ ọlaọcha anọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.