Ọpụpụ 26

Jiri ọlaedo machie mbudo ibo ndị ahụ niile, kpụọ mgbaaka ọlaedo ka ọ bụrụ ọnọdụ ịchịkọta osisi ntụbichi ndị a. Jirikwa ọlaedo machie osisi ntụbichi ndị a.

Exodus 26:29 (UKJV) And you shall overlay the boards with gold, and make their rings of gold for places for the bars: and you shall overlay the bars with gold.

27ise nke ọzọ maka ndị dị nʼakụkụ nke ọzọ, ise nke ọzọ maka mbudo ibo dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, nʼebe ndịda ndịda nke ụlọ nzute ahụ.

28Osisi ntụbichi nke dị nʼetiti ga-esite nʼotu isi ruo nʼisi nke ọzọ nke mbudo ibo ahụ.

29Jiri ọlaedo machie mbudo ibo ndị ahụ niile, kpụọ mgbaaka ọlaedo ka ọ bụrụ ọnọdụ ịchịkọta osisi ntụbichi ndị a. Jirikwa ọlaedo machie osisi ntụbichi ndị a.

30“Guzobe ụlọ nzute a nʼusoro dịka ụdịdị ihe ahụ m ziri gị nʼelu ugwu si dị.

31“Meekwa akwa mgbochi nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, onye ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.