1“Ị ga-eji osisi akashia wuo ebe ịchụ aja. Ịdị elu ya ga-abụ otu mita na iri sentimita anọ. Ogologo ya na obosara ya ga-aha nʼotu, mita abụọ na iri sentimita atọ, mita abụọ na iri sentimita atọ.
2Rụnye mpi nʼakụkụ anọ nke ebe ịchụ aja ahụ nʼotu nʼotu. Mee ka mpi ndị a na ebe ịchụ aja ahụ bụrụ ihe e jikọtara nʼotu. Jiri bronz machie ebe ịchụ aja a.
3Jiri bronz kpụọ ngwongwo niile dị iche iche, ya bụ efere ikpofu ntụ, shọvel ya niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ngaji eze ịdụta anụ na efere ndị e ji agụ ọkụ.