Ọpụpụ 27

Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, ebe anwụ na-awalite, akwa mgbochi ahụ ga-adịkwa iri mita abụọ na atọ nʼobosara.

Exodus 27:13 (UKJV) And the breadth of the court on the east side eastward shall be fifty cubits.

11Otu a kwa, akụkụ ugwu ga-adịkwa iri mita anọ na ise. Ọ ga-enwe akwa mgbochi, nwekwa iri ogidi abụọ na iri ebe ndọkwasị abụọ nke e ji bronz kpụọ, ya na anya nko nke ọlaọcha na ihe e ji ekegide ha nʼogidi ahụ.

12“Akụkụ ọdịda anyanwụ nke ogige ahụ ga-adị iri mita abụọ na atọ nʼobosara. Ọ ga-enwe akwa mgbochi, na ogidi iri na ebe ndọkwasị iri.

13Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, ebe anwụ na-awalite, akwa mgbochi ahụ ga-adịkwa iri mita abụọ na atọ nʼobosara.

14Akwa mgbochi nke ogologo ya dị mita isii na sentimita iri asatọ ga-adị nʼotu akụkụ nke ọnụ ụzọ mbata ahụ. O nwere ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ.

15Otu a kwa, akwa mgbochi nke ịdị ogologo ya dị mita asaa ga-adị nʼakụkụ nke ọzọ. Ọ ga-enwekwa ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.