Ọpụpụ 27

Akwa mgbochi nke ogologo ya dị mita isii na sentimita iri asatọ ga-adị nʼotu akụkụ nke ọnụ ụzọ mbata ahụ. O nwere ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ.

Exodus 27:14 (UKJV) The hangings of one side of the gate shall be fifteen cubits: their pillars three, and their sockets three.

12“Akụkụ ọdịda anyanwụ nke ogige ahụ ga-adị iri mita abụọ na atọ nʼobosara. Ọ ga-enwe akwa mgbochi, na ogidi iri na ebe ndọkwasị iri.

13Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, ebe anwụ na-awalite, akwa mgbochi ahụ ga-adịkwa iri mita abụọ na atọ nʼobosara.

14Akwa mgbochi nke ogologo ya dị mita isii na sentimita iri asatọ ga-adị nʼotu akụkụ nke ọnụ ụzọ mbata ahụ. O nwere ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ.

15Otu a kwa, akwa mgbochi nke ịdị ogologo ya dị mita asaa ga-adị nʼakụkụ nke ọzọ. Ọ ga-enwekwa ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ.

16“Banyere ọnụ ụzọ mbata nke ogige ahụ, mee akwa mgbochi ga-adị mita itoolu nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, akaọrụ nke onye na-akpa ihe ịchọ mma. Ọ ga-enwe ogidi anọ na ihe ndọkwasị anọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.