18Ogologo ogige ahụ ga-abụ iri mita anọ na ise. Ebe obosara ya ga-adị iri mita abụọ na atọ. Ọ ga-enwe akwa mgbochi nke ịdị elu ya dị iri mita abụọ na atọ, nke e ji ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee, nwekwa ebe ndọkwasị bronz.
19Ngwongwo niile nke e ji eje ozi nʼụlọ nzute ahụ, ihe ọbụla bụ ọrụ ha, tinyere ǹtu ya niile na nke ogige ahụ, ga-abụ ihe e ji bronz rụọ.
20“Nye ndị Izrel niile iwu ka ha wetara gị mmanụ oliv asụrụ asụ nke a na-agwaghị ihe maka itinye nʼiheọkụ ime ka ọkụ oriọna na-enwu mgbe niile.
21Nʼime ụlọ nzute ahụ, na mpụta nke akwa mgbochi nke kpuchiri igbe Ihe Ama ahụ, Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eme ka oriọna ndị ahụ dị nʼihu Onyenwe anyị, na-enwu ọkụ, site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ. Nke a bụ ụkpụrụ ga-adịgide nʼetiti ndị Izrel nye ọgbọ niile dị nʼihu.