3Jiri bronz kpụọ ngwongwo niile dị iche iche, ya bụ efere ikpofu ntụ, shọvel ya niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ngaji eze ịdụta anụ na efere ndị e ji agụ ọkụ.
4Ị ga-eme ngịga mbadamba, ihe ọkpụkpa bronz, meekwa mgbaaka bronz nke ga-adị nʼakụkụ anọ nke ngịga ahụ.
5Tinye ya nʼokpuru oghere dị nʼebe ịchụ aja ahụ. Tinye ya ka ọ dịrị nʼetiti ebe ịchụ aja ahụ.
6Jiri osisi akashia mee mkpara osisi maka ebe ịchụ aja ahụ, were bronz machie ha.
7A ga-eme ka mkpara ahụ baa nʼime mgbaaka ndị ahụ, ka ha dị nʼakụkụ abụọ nke ebe ịchụ aja ahụ mgbe ọbụla a na-ebu ya.