5Tinye ya nʼokpuru oghere dị nʼebe ịchụ aja ahụ. Tinye ya ka ọ dịrị nʼetiti ebe ịchụ aja ahụ.
6Jiri osisi akashia mee mkpara osisi maka ebe ịchụ aja ahụ, were bronz machie ha.
7A ga-eme ka mkpara ahụ baa nʼime mgbaaka ndị ahụ, ka ha dị nʼakụkụ abụọ nke ebe ịchụ aja ahụ mgbe ọbụla a na-ebu ya.
8Jiri obodobo osisi rụọ ebe ịchụ aja ahụ, ka o nwee oghere nʼime, dịka igbe. Ị ga-arụ ya dịka e gosiri gị nʼelu ugwu ahụ.
9“Ị ga-arụkwa ogige maka ụlọ nzute ahụ. Nʼakụkụ ndịda ya ga-adị iri mita anọ na ise nʼogologo. Ọ ga-enwekwa akwa mgbochi nke e ji ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee.