Ọpụpụ 28

Ị ga-eji ọlaedo mee ihe ịchọ mma a tụrụ atụ.

Exodus 28:13 (UKJV) And you shall make casings of gold;

11Gbunye aha ụmụ ndị nwoke Izrel nʼelu nkume abụọ ndị ahụ, dịka onye ǹka si egbunye akara na nkume. Mgbe ahụ, hịọnye nkume ndị ahụ nʼime ihe ọlaedo ahụ a kpara akpa,

12jikọta ha nʼelu akwa ubu nke efọọd ahụ ka ọ bụrụ nkume ncheta mgbe ebighị ebi nye ụmụ Izrel. Erọn ga-ebukwa aha ndị a nʼelu ubu ya abụọ, dịka ihe ncheta nʼihu Onyenwe anyị.

13Ị ga-eji ọlaedo mee ihe ịchọ mma a tụrụ atụ.

14Jirikwa ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ eriri a tụhịkọtara dịka ụdọ, jikọta eriri ọlaedo ahụ na ihe ịchọ mma ndị ahụ.

15“Ị ga-adụ ihe mgbochi obi nke ikpe, nke bụ ọrụ aka onye ǹka. Mee ya dịka efọọd ahụ: jiri ogho edo edo, nke anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na nke uhie uhie nakwa ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.