1“Ugbu a, site nʼetiti ụmụ Izrel kpọbata nwanne gị nwoke Erọn, ya na ụmụ ya ndị ikom, bụ Nadab, na Abihu, na Elieza na Itama. Ka ha jeere m ozi dịka ndị nchụaja.
2Meere Erọn nwanne gị nwoke uwe nsọ, nke ga-enye ya ugwu na nsọpụrụ.
3Gwa ndị niile nwere onyinye ǹka nʼịdụ akwa, bụ ndị m nyere amamihe nʼihe ndị a, sị ha dụọrọ Erọn uwe pụrụ iche, nke e ji edo ya nsọ, ime ya onye na-ejere m ozi dịka onye nchụaja.
4Nke a bụ ụdị uwe ha ga-adụ: Ihe mgbochi obi, efọọd, uwe ime ahụ akpara akpa na-enweghị aka na uwe mwụda buru ibu, na uwe ime ahụ nke tụrụ agwa agwa na akwa a na-atụhị nʼisi na nke a na-eke nʼukwu. Ha ga-adụrụ Erọn nwanne gị nwoke na ụmụ ya ndị ikom uwe ndị a dị nsọ. Ka ha na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja.