Ọpụpụ 28

Ị ga-akpụ mgbaaka ọlaedo abụọ ọzọ, konye ha nʼelu ubu abụọ nke efọọd ahụ, nʼokpuru nʼebe nʼihu ya, na nso nso ebe a dụkọtara ya, nʼelu ihe okike ukwu nke efọọd ahụ.

Exodus 28:27 (UKJV) And two other rings of gold you shall make, and shall put them on the two sides of the ephod underneath, toward the front part thereof, opposite to the other coupling thereof, above the curious girdle of the ephod.

25were isi ndị ọzọ nke ụdọ ahụ dụnye nʼihe ahụ a kpara akpa, konye ha nʼelu ubu efọọd ahụ, nʼebe ihu ya.

26Ị ga-emekwa mgbaaka ọlaedo, konye ha na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ, nʼime ọnụ ọnụ ya ebe dị nso efọọd ahụ.

27Ị ga-akpụ mgbaaka ọlaedo abụọ ọzọ, konye ha nʼelu ubu abụọ nke efọọd ahụ, nʼokpuru nʼebe nʼihu ya, na nso nso ebe a dụkọtara ya, nʼelu ihe okike ukwu nke efọọd ahụ.

28A ga-eji eriri na-acha anụnụ kekọta mgbaaka ihe mgbochi obi ahụ na mgbaaka efọọd ahụ, jikọtaa ya na ihe okike ukwu ahụ, ime ka ihe mgbochi obi ahụ ghara ịtọghapụ site nʼefọọd ahụ.

29“Nʼụzọ dị otu a, mgbe ọbụla Erọn banyere nʼEbe Nsọ, ọ ga-ebu aha ụmụ ndị ikom Izrel niile nʼelu obi ya, nʼelu ihe mgbochi obi nke ikpe ahụ, dịka ihe ncheta nʼihu Onyenwe anyị mgbe niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.