29“Nʼụzọ dị otu a, mgbe ọbụla Erọn banyere nʼEbe Nsọ, ọ ga-ebu aha ụmụ ndị ikom Izrel niile nʼelu obi ya, nʼelu ihe mgbochi obi nke ikpe ahụ, dịka ihe ncheta nʼihu Onyenwe anyị mgbe niile.
30Ị ga-etinyekwa nʼime ihe mgbochi obi ahụ ụmụ nkume abụọ e ji ajụta ase nke bụ Urim na Tumim. Ha ga-adị nʼelu obi Erọn mgbe ọbụla ọ gara nʼihu Onyenwe anyị. Otu a kwa, Erọn ga-ebukwa ihe e ji ajụta ase banyere ndị Izrel nʼelu obi ya mgbe niile, nʼihu Onyenwe anyị.
31“Ọ bụ akwa nke na-acha anụnụ anụnụ, ka ị ga-eji dụọ uwe mwụda efọọd ahụ.
32Ọ ga-enwe oghere nʼetiti ya ebe a ga-esi na-etinye isi. A ga-enwe ihe ọkpụkpa gburugburu oghere a dịka nke olu uwe agha, ime ka o sie ike, ghara ịdọka.
33Nʼọnụ ala ala uwe ahụ gburugburu, ị ga-akpanye ihe ọkpụkpa oyiyi mkpụrụ pomegranet. Ọ bụ ogho nke na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie ka ị ga-eji. Ị ga-akpanyekwa ataṅụ ọlaedo nʼetiti ha.