6“Weere ogho ọlaedo, na nke na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee efọọd ahụ, nke bụ akaọrụ onye ǹka.
7Ọ ga-enwe akwa nʼubu ya abụọ nke e ji ejikọta ọnụ nkuku ya abụọ, ka e nwe ike na-ekechisi ya ike.
8Ihe okike nke ukwu ahụ nke onye ǹka kpaziri nke ọma ga-adị ka ya. Ya na efọọd ahụ bụ otu, nke e ji ogho na-acha edo edo, nke anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie, nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee.
9“Were nkume ọniks abụọ, gbunye aha ụmụ ndị nwoke Izrel nʼelu ya,
10nʼusoro dịka e si mụọ ha, isii nʼelu otu nkume, isii fọdụrụ na nkume nke ọzọ.