7Ọ ga-enwe akwa nʼubu ya abụọ nke e ji ejikọta ọnụ nkuku ya abụọ, ka e nwe ike na-ekechisi ya ike.
8Ihe okike nke ukwu ahụ nke onye ǹka kpaziri nke ọma ga-adị ka ya. Ya na efọọd ahụ bụ otu, nke e ji ogho na-acha edo edo, nke anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie, nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee.
9“Were nkume ọniks abụọ, gbunye aha ụmụ ndị nwoke Izrel nʼelu ya,
10nʼusoro dịka e si mụọ ha, isii nʼelu otu nkume, isii fọdụrụ na nkume nke ọzọ.
11Gbunye aha ụmụ ndị nwoke Izrel nʼelu nkume abụọ ndị ahụ, dịka onye ǹka si egbunye akara na nkume. Mgbe ahụ, hịọnye nkume ndị ahụ nʼime ihe ọlaedo ahụ a kpara akpa,