1“Nke a ga-abụ usoro mmemme nke ị ga-eme, iji doo Erọn na ụmụ ya ndị ikom nsọ, ka ha na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja. Were nwa oke ehi na ebule abụọ nke na-enweghị ntụpọ ọbụla.
2Werekwa ọka wiiti a kwọrọ nke ọma, mee achịcha nke na-enweghị ihe na-eko achịcha e tinyere nʼime ha, achịcha mbadamba na-ekoghị eko nke e ji mmanụ oliv gwakọtaa, ya na achịcha mbadamba ọzọ dị nta na-ekoghị eko nke e tere mmanụ nʼahụ ya.
3Mgbe ahụ, ị ga-etinye achịcha ndị a niile nʼime otu nkata, bute ha nʼime nkata ahụ, wetakwa nwa oke ehi, na ebule abụọ.