31“Were anụ ebule ido nsọ ahụ, sienụ anụ ahụ nʼebe dị nsọ.
32Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri anụ ebule ahụ, na achịcha ndị ahụ dị nʼime nkata nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
33Ha ga-eri ihe ndị aja niile ahụ nke e ji chụọ aja mkpuchi mmehie, nʼoge ido nsọ ha. Ọ dịghị onye ọbụla ọzọ ga-eso ha rie ya, nʼihi na ha bụ ihe dị nsọ.
34Ọ bụrụ na ụfọdụ nʼime anụ na achịcha ido nsọ ndị ahụ afọdụ ruo ụtụtụ, a ga-akpọ ha ọkụ. A gaghị eri ya ọzọ, nʼihi na ọ bụ ihe dị nsọ.
35“Ọ bụ otu a ka a ga-esi doo Erọn na ụmụ ya ndị ikom nsọ, dịka ihe niile m nyere gị nʼiwu si dị. Ọ ga-ewe ụbọchị asaa iji doo ha nsọ.