44“E, aga m edo ụlọ nzute ahụ nsọ, ya na ebe ịchụ aja, na Erọn na ụmụ ya ndị ikom, ka ha na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja.
45Mgbe ahụ, aga m ebi nʼetiti ụmụ Izrel, bụrụkwa Chineke ha.
46Ha ga-amata na m bụ Onyenwe anyị Chineke ha. Onye sitere nʼala Ijipt kpọpụta ha, ka m si otu a biri nʼetiti ha. Abụ m Onyenwe anyị Chineke ha.