43Nʼebe ahụ kwa ka m ga-ezute ndị Izrel niile. Nʼihi ya, aga m esite nʼịdị ebube m doo ebe ahụ nsọ.
44“E, aga m edo ụlọ nzute ahụ nsọ, ya na ebe ịchụ aja, na Erọn na ụmụ ya ndị ikom, ka ha na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja.
45Mgbe ahụ, aga m ebi nʼetiti ụmụ Izrel, bụrụkwa Chineke ha.
46Ha ga-amata na m bụ Onyenwe anyị Chineke ha. Onye sitere nʼala Ijipt kpọpụta ha, ka m si otu a biri nʼetiti ha. Abụ m Onyenwe anyị Chineke ha.