Ọpụpụ 29

Nʼebe ahụ kwa ka m ga-ezute ndị Izrel niile. Nʼihi ya, aga m esite nʼịdị ebube m doo ebe ahụ nsọ.

Exodus 29:43 (UKJV) And there I will meet with the children of Israel, and the tabernacle shall be sanctified by my glory.

41Jirikwa nwa atụrụ nke ọzọ, ya na otu ụdị aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ ya dịka i mere nʼụtụtụ. Aja isisi ya dị ezi mma, nke e sitere nʼọkụ a na-achụ nye Onyenwe anyị.

42“A ga na-achụ aja nsure ọkụ a oge niile nʼọgbọ niile, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute m ka a ga-achụ ya, nʼihu Onyenwe anyị. Nʼihi nʼebe ahụ ka m ga-ezute gị gwa gị okwu.

43Nʼebe ahụ kwa ka m ga-ezute ndị Izrel niile. Nʼihi ya, aga m esite nʼịdị ebube m doo ebe ahụ nsọ.

44“E, aga m edo ụlọ nzute ahụ nsọ, ya na ebe ịchụ aja, na Erọn na ụmụ ya ndị ikom, ka ha na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja.

45Mgbe ahụ, aga m ebi nʼetiti ụmụ Izrel, bụrụkwa Chineke ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.