Ọpụpụ 29

Werekwa mmanụ nsọ ahụ, tee ya, site nʼịwụkwasị ya nʼisi ya.

Exodus 29:7 (UKJV) Then shall you take the anointing oil, and pour it upon his head, and anoint him.

5Yikwasị Erọn uwe ime ahụ, uwe mwụda nke efọọd, efọọd ahụ na ihe mgbochi obi. Were ihe okike efọọd ahụ nke akpaziri nke ọma kegide ya efọọd ahụ nʼahụ.

6Tụhịakwa akwa ike nʼisi ahụ nʼisi ya. Tinye okpu nsọ ahụ nʼelu akwa ike nʼisi ahụ.

7Werekwa mmanụ nsọ ahụ, tee ya, site nʼịwụkwasị ya nʼisi ya.

8Kpọta ụmụ ya ndị ikom, yikwasị ha uwe ime ahụ.

9Kekwasịkwa ha ihe okike nʼisi. Keekwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom ihe ike nʼukwu. Mgbe ahụ ọrụ ndị nchụaja ga-abụ nke ha site nʼụkpụrụ ebighị ebi. “Nʼụzọ dị otu a ka ị ga-esi doo Erọn na ụmụ ya ndị ikom nsọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.