Ọpụpụ 3

Chineke gakwara nʼihu gwa Mosis sị, Si otu a gwa ụmụ Izrel okwu. “Onyenwe anyị, Chineke nna nna unu, Chineke Ebraham, Chineke Aịzik na Chineke Jekọb, zitere m ịbịakwute unu.” Nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi, aha nke e ji echeta m site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Exodus 3:15 (UKJV) And God said moreover unto Moses, Thus shall you say unto the children of Israel, the LORD God of your fathers, the God of Abraham, the God of Isaac, and the God of Jacob, has sent me unto you: this is my name for ever, and this is my memorial unto all generations.

13Ma Mosis jụrụ Chineke sị, “Ọ bụrụ na m agwa ụmụ Izrel sị, ‘Chineke nna nna unu zitere m izi unu ozi,’ ha ga-ajụ m sị, ‘Gịnị bụ aha ya?’ Gịnị ka m ga-aza ha?”

14Chineke sịrị Mosis, “ABỤ M ONYE M BỤ. Naanị gwa ụmụ Izrel na ‘ABỤ M zitere gị.’ ”

15Chineke gakwara nʼihu gwa Mosis sị, Si otu a gwa ụmụ Izrel okwu. “Onyenwe anyị, Chineke nna nna unu, Chineke Ebraham, Chineke Aịzik na Chineke Jekọb, zitere m ịbịakwute unu.” Nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi, aha nke e ji echeta m site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

16“Gaa, kpọkọta ndị okenye Izrel niile zie ha sị, ‘Onyenwe anyị Chineke nna nna unu, Chineke Ebraham, Chineke Aịzik, na Chineke Jekọb, egosila m onwe ya, sị m, Eleruola m ọnọdụ unu anya hụ ihe a na-eme unu nʼala Ijipt.

17Ekweela m nkwa ịkpọpụta unu site nʼahụhụ unu na-ahụ nʼala Ijipt duru unu baa nʼala nke ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus bi nʼime ya. Ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.