20Ma aga m esetipụ aka m tie Ijipt ihe otiti, site nʼihe ịrịbama dị iche iche nke m ga-eme nʼetiti ya. Mgbe nke a gasịrị, ọ ga-ahapụ unu ka unu laa.
21“Aga m emekwa ka unu nweta amara nʼihu ndị Ijipt, ka unu ghara ịgba aka mgbe unu na-ala.
22Nwanyị ọbụla ga-arịọ site nʼaka nwanyị Ijipt onye agbataobi ya na nwanyị ọbịa bi nʼụlọ ya, ihe niile e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ, na akwa dị iche iche. Unu ga-eyikwasị ha ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom, bịa si otu a kwakọrọ ngwongwo ndị Ijipt.”