19Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga na-asa ụkwụ na aka ha site na ya.
20Mgbe ọbụla ha na-aba nʼụlọ nzute ahụ, ha ga-eji mmiri saa onwe ka ha ghara ịnwụ. Ọzọkwa, mgbe ha na-abịaru nso nʼebe ịchụ aja, maka ije ozi iche onyinye nʼihu Onyenwe anyị site nʼọkụ,
21ha ga-asa aka ha na ụkwụ ha, ka ha ghara ịnwụ. Nke a ga-abụ ụkpụrụ dịrị Erọn na ụmụ ya ndị ikom site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.”
22Ọzọkwa, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
23“Were eso osisi na-esi isi ụtọ ndị a dị iche iche: máá, nke ọtụtụ ya ruru kilo isii, na ihe ruru kilo sinamọn abụọ na ụma itoolu, na kilo kalamus atọ,