Ọpụpụ 30

na kilo kashia isii, na lita anọ na ụma asatọ nke mmanụ oliv, dịka ọtụtụ shekel ebe nsọ ahụ si dị.

Exodus 30:24 (UKJV) And of cassia five hundred shekels, after the shekel of the sanctuary, and of oil olive an hin:

22Ọzọkwa, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,

23“Were eso osisi na-esi isi ụtọ ndị a dị iche iche: máá, nke ọtụtụ ya ruru kilo isii, na ihe ruru kilo sinamọn abụọ na ụma itoolu, na kilo kalamus atọ,

24na kilo kashia isii, na lita anọ na ụma asatọ nke mmanụ oliv, dịka ọtụtụ shekel ebe nsọ ahụ si dị.

25Ị ga-eji ya mepụta mmanụ nsọ, nke dị nsọ, nke a gwakọtara nke ọma dịka nke onye na-eme mmanụ na-esi isi ụtọ mere. Ọ ga-abụ mmanụ otite dị nsọ.

26Ị ga-ewere mmanụ ahụ tee ụlọ nzute ahụ niile na igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.