Ọpụpụ 30

Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Nke a bụ mmanụ nsọ m, nke dị nsọ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Exodus 30:31 (UKJV) And you shall speak unto the children of Israel, saying, This shall be an holy anointing oil unto me throughout your generations.

29Ị ga-edo ha nsọ, ka ha bụrụ ihe dịkarịrị nsọ. Ihe ọbụla metụrụ ha ahụ ga-adịkwa nsọ.

30“Ị ga-eji mmanụ otite a tee Erọn na ụmụ ya ndị ikom. Ha niile ga-adịkwa nsọ, bụrụ ndị na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja.

31Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Nke a bụ mmanụ nsọ m, nke dị nsọ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

32Agaghị awụsa ya nʼahụ mmadụ. O nwekwaghị onye kwesiri imepụta mmanụ otite dị otu a. Ọ dị nsọ, unu kwesikwara ido ya nsọ.

33A ga-esite nʼetiti ndị m wezuga onye ọbụla mere ụdị mmanụ isi ọma a, maọbụ tee ya onye na-abụghị onye nchụaja m.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.