27na tebul ahụ, na ngwongwo ya niile, na nʼihe ịdọsa oriọna, na nʼihe niile dị ya nʼahụ, na nʼebe ịdọsa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ,
28na nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na ngwongwo ya niile, na nʼite ịsa ụkwụ na aka, na nʼebe a na-adọba ya.
29Ị ga-edo ha nsọ, ka ha bụrụ ihe dịkarịrị nsọ. Ihe ọbụla metụrụ ha ahụ ga-adịkwa nsọ.
30“Ị ga-eji mmanụ otite a tee Erọn na ụmụ ya ndị ikom. Ha niile ga-adịkwa nsọ, bụrụ ndị na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja.
31Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Nke a bụ mmanụ nsọ m, nke dị nsọ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.