Ọpụpụ 32

Ugbu a, hapụ m ka iwe m bịakwasị ha, ka m laa ha nʼiyi. Aga m eme ka gị onwe gị bụ Mosis bụrụ mba ukwu nʼọnọdụ ha.”

Exodus 32:10 (UKJV) Now therefore let me alone, that my wrath may wax hot against them, and that I may consume them: and I will make of you a great nation.

8Nʼotu ntabi anya a, ha ahapụla ụzọ m niile. Ha akpụọlara onwe ha arụsị nwa oke ehi, nke ha na-efe ofufe, nke ha chụkwaara aja nye. Ha kwukwara sị, ‘Ndị Izrel, ndị a bụ chi unu, nke dupụtara unu site nʼala Ijipt.’ ”

9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Ahụla m na ndị a bụ ndị isiike, na ndị na-enupu isi.

10Ugbu a, hapụ m ka iwe m bịakwasị ha, ka m laa ha nʼiyi. Aga m eme ka gị onwe gị bụ Mosis bụrụ mba ukwu nʼọnọdụ ha.”

11Ma Mosis rịọrọ Onyenwe anyị Chineke ya arịrịọ sị ya, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gịnị mere iwe gị ji dị ọkụ otu a nʼebe ndị gị nọ bụ ndị nke i ji ike ebube gị, na ọtụtụ ihe ịrịbama dị ịtụnanya, dupụta site nʼala Ijipt?

12Nʼihi gịnị ka ndị Ijipt ga-ekwu sị, ‘Ọ bụghị ime ha ihe ọjọọ ka o ji dupụta ha, ka o nwee ike gbuo ha nʼugwu ndị a, ma kpochapụkwa ha site nʼelu ụwa a?’ Site nʼiwe gị dị ọkụ chigharịa, kwere ka ọ dajụọ. Chigharịakwaa site nʼatụmatụ ọjọọ a nʼebe ndị gị nọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.